Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa; Ka ndi nākpọ Ya asì si n'iru Ya b͕alaga. Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha: Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku, Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì. Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke: E, ka ha wulie elu n'ọṅù. Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma: Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi; Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya. Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru, Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ. Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo: Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma: Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku.
Gụọ ABÙ ỌMA 68
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 68
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 68:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo