Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 68:1-18

ABÙ ỌMA 68:1-18 IGBOB

Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa; Ka ndi nākpọ Ya asì si n'iru Ya b͕alaga. Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha: Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku, Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì. Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke: E, ka ha wulie elu n'ọṅù. Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma: Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi; Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya. Nna nke umu-nb͕ei, na onye-ikpe nke ndinyom di-ha nwuru, Ka Chineke bu n'ebe-obibi-Ya di nsọ. Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo: Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma: Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku. Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi, Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah Ala mara jijiji, Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke: Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel. Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke, Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike. Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya: I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke. Onye-nwe-ayi nēnye okwu: Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba. Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga: Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha. Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu, Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie, Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua. Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya, Snow nēzò na Zalmon. Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu; Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu. Unu ugwu nwere ugwu n'elu unu, n'ìhi gini ka unu ji ekworo Le ugwu ahu anya nke Chineke chọsiworo ike ibu ebe-obibi-Ya? E, Jehova gēbi nime ya rue mb͕e ebighi-ebi. Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya. I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha; I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu, E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha.