Chineke, nuru olu iti-nkpum; Ṅa nti ekperem. M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike: Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je. N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro. Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi: M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha. I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze: Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ. O gēbi n'iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi: Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya. Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.
Gụọ ABÙ ỌMA 61
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 61
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 61:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị