Merem amara, Chineke, merem amara; N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo: Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà, Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga. M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu; M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe. O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam, Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Selah Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya. Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile. Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile; Nkpuru-obim erudawo n'ala: Ha egwuwo olùlù n'irum; Ha adabàwo n'etiti ya. Selah
Gụọ ABÙ ỌMA 57
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 57
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 57:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo