ABÙ ỌMA 57:1-6
ABÙ ỌMA 57:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Merem amara, Chineke, merem amara; N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo: Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà, Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga. M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu; M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe. O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam, Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Selah Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya. Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile. Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile; Nkpuru-obim erudawo n'ala: Ha egwuwo olùlù n'irum; Ha adabàwo n'etiti ya. Selah
ABÙ ỌMA 57:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela