N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem: Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede, Ka ha ridarue ala-mọ na ndu: N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha. Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku; Jehova gāzọputakwam. Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude: Ọ gānu kwa olum. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso: N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù. Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala, Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. Selah Ha bu ndi nēnweghi nb͕anwe, Ha adighi-atu kwa egwu Chineke. O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo: O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ. Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa. Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi: Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi Ma Gi onwe-gi, Chineke, gēme ka ha rida n'olùlù nbibi: Ndi bu ndi-ọbara na ndi-aghughọ agaghi-adiru nkera ubọchi-ha; Ma mu onwem gātukwasi obi na Gi.
Gụọ ABÙ ỌMA 55
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 55
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 55:12-23
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo