Obim ab͕ọputawo okwu di nma: Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze: Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa. Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike, Ebube-gi na ima-nma-gi. N'ima-nma-gi nọkwasi n'elu inyinya ga nke-ọma, N'ihi ezi-okwu na ume-ala-n'obi na ezi omume: Aka-nri-gi gēzí kwa gi ihe di iche iche di egwu. Àkú-gi nile bu ihe di nkọ; Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi; Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze. Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi: Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu. I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì: N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi. Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile; Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu. Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia: Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.
Gụọ ABÙ ỌMA 45
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 45
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 45:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo