Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya, Ka m'we ghara iwere irem mehie: Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu, Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum. Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe; Ewe kpalie ihe-nb͕um. Obim di ọku nimem; Mb͕e m'nātughari uche ọku rebere: M'we were irem kwue okwu: Jehova, me ka m'mara ọgwugwum, Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu; Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi. Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha. Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini? Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di. Naputam n'aka njehiem nile: Emelam ka m'buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu. Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya. Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi: Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi. I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume, I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum; Ab͕ala nkiti n'anya-mirim: N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ, Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile. Lepum anya, ka m'we b͕asa irum, Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n'uwa.
Gụọ ABÙ ỌMA 39
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 39
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 39:1-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo