ABÙ ỌMA 39:1-13
ABÙ ỌMA 39:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya, Ka m'we ghara iwere irem mehie: Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu, Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum. Aghọrọm onye-ob͕i n'inọ-dū, ab͕aram nkiti, ọbuná ipu n'ikwu ezi ihe; Ewe kpalie ihe-nb͕um. Obim di ọku nimem; Mb͕e m'nātughari uche ọku rebere: M'we were irem kwue okwu: Jehova, me ka m'mara ọgwugwum, Na ọtùtù ubọchim nile, ihe ọ bu; Ka m mara ka msi buru ihe nākwusi akwusi. Le, I mewo ubọchim nile dika ntu-ọbu-aka; Mb͕e ndum di kwa ka ihe nābughi ihe n'iru Gi: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu, n'iguzosi-ike-ya. Selah N'ezie ọ bu n'onyinyo ka madu nējeghari: N'ezie n'otù nku-ume ka ha nāb͕a aghara: Ọ nākwakọba àkù, ma ọ maghi onye gāchikọta ha. Ma ub͕u a, Onye-nwe-ayi, m'leworo anya gini? Ncherem, n'ebe I nọ ka ọ di. Naputam n'aka njehiem nile: Emelam ka m'buru ihe-ita-uta nke onye-nzuzu. Aghọrọm onye-ob͕i, adighm-asaghe ọnum; N'ihi na Gi onwe-gi mere ya. Si n'arum wezuga ihe-otiti-Gi: Emewo ka mu onwem gwusia site n'ilu-ọ̀gù nke aka-Gi. I ji iba-nba nile dọ madu aka na nti n'ihi ajọ omume, I we me ima-nma-ya anāchọsi ike ka ọ b͕aze dika nla: N'ezie nání otù nku-ume ka madu ọ bula bu. Selah Nuru ekperem, Jehova, ṅa kwa nti ntikum; Ab͕ala nkiti n'anya-mirim: N'ihi na ọbìa ka m'bu n'ebe I nọ, Abum onye-nnọdu, dika nnam-hà nile. Lepum anya, ka m'we b͕asa irum, Tutu mu ala, ghara inọ kwa ọzọ n'uwa.
ABÙ ỌMA 39:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.” Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara. Obi m kporo ọkụ nʼime m, ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; mgbe ahụ ekwuru m okwu sị: “O ONYENWE ANYị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa. I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela “Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ. “Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? Olileanya m dị nʼime gị. Zọpụta m site na mmehie m niile; ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu. Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a. Kwụsị iti m ihe; ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ. Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela “O ONYENWE ANYị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; emechila ntị gị nye ibe akwa m. Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere. Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”