ABÙ ỌMA 37:32-40
ABÙ ỌMA 37:32-40 IGBOB
Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche, Nāchọ kwa ime ka ọ nwua. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya, Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe. Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya, Ọ gēbuli kwa gi inweta ala: Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu. Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya. O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya. Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi: N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo. Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù: Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu. Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia: Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà. Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu: Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha, N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.

