Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha. Jide ọta na ọta uku, Bilie iyerem aka. Seputa kwa ube na anyu-ike-agha izute ndi nāchum: Si nkpuru-obim, Nzọputa-gi ka M'bu. Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem. Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha. Ka uzọ-ha b͕a ọchichiri, ka ọ buru kwa ebe nālo nālọ, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nāchu ha. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha, Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova: Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi? Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya, I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.
Gụọ ABÙ ỌMA 35
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 35
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 35:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị