Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 25:1-22

ABÙ ỌMA 25:1-22 IGBOB

Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim. Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum. Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha: Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu. Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile; Zím okporo-uzọ-Gi nile. Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile. Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile; N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo. Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova. Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu: Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé: Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ. N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova? O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma, Nkpuru-ya gēnweta kwa ala. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile; N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta. Chem iru, me-kwa-ram amara; N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu. Ahuhu nile nke obim sara mbara: Me ka m'si na nkpàm nile puta. Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm; Bupu kwa nmehiem nile. Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu; Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi. Debe nkpuru-obim, naputakwam: Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi. Chineke, b͕aputa Israel Na nkpà-ya nile.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara