ABÙ ỌMA 132
132
Abú Nrigo.
1Jehova, chetara Devid
Nweda-n'ala-ya nile.
2Otú ọ ṅuru Jehova iyi,
Kwe Dike nke Jekob nkwa:
3N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom,
M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem;
4M'gaghi-enye anyam abua ura,
M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura;
5Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu,
Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.
6Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata:
Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia.
7Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile;
Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di.
8Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi;
Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.
9Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe;
Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.
10N'ihi Devid, bú orù-Gi,
Atugharila iru onye-Gi etere manu.
11Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu;
Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu:
Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere.
12Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndum
Na ihe-àmàm nke M'gēzí ha,
Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi.
13N'ihi na Jehova arọputawo Zaion;
Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi.
14Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi:
N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike.
15Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku:
Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha.
16Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe:
Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.
17N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue:
Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.
18Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere dika uwe:
Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ABÙ ỌMA 132: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.