Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile. Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe? Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di. Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka. Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile. Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi. Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe. Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo. Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi. Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam. Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu. Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche. Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.
Gụọ ABÙ ỌMA 119
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 119:81-96
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo