Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:73-176

ABÙ ỌMA 119:73-176 IGBOB

Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo. Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala. Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di. Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile. Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile. Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem. Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile. Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe? Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di. Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka. Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile. Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi. Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe. Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo. Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi. Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam. Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu. Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche. Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku. Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche. Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom; N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim. Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche. Anamaghọta ihe kari ndi-okenye, N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo. Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula, Ka m'we debe okwu-Gi. Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe. Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu. M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì. Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm. Aṅuwom iyi, me ka o guzosie ike, Na m'gēdebe ikpé nile nke ezi omume-Gi. Ewedawom n'ala nke-uku: Me ka m'di ndu, Jehova, dika okwu-Gi si di. Biko, ka onyinye-afọ-ofufo nile nke ọnum tọ Gi utọ, Jehova, Zíkwam ikpé-Gi nile. Nkpuru-obim di n'ọbu-akam mb͕e nile; Ma echezọghm iwu-Gi. Ndi nēmebi iwu esiworom ọnya; Ma esighm nihe-iriba-ama-Gi nile fugharia. Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu. Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu. Ndi nwere uche abua ka m'kpọworo asì: Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: Okwu-Gi ka m'chereworo. Sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu ndi nēme ihe ọjọ; Ka m'we chebe ihe nile Chinekem nyere n'iwu. Kwagidem dika okwu-ọnu-Gi si di, ka m'we di ndu; Eme-kwa-la ka ihere olile-anyam mem. Kwaliem elu, ewe zọputam, M'gēle kwa ukpuru-Gi nile anya ọma mb͕e nile. I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya, N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu. I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru: N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya. Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi; Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha. Emewom ikpe ekpere na ezi omume: Arapulam nye ndi nēmeb͕um. Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma: Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem. Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike, Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike. Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di, Zíkwam ukpuru-Gi nile Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe, Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile. Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu; Ha emebiwo iwu-Gi. N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anya Kari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha. N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi; Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì. Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu: N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike; N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike. Chem iru, me-kwa-ram amara, Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi: Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim. B͕aputam na nmeb͕u nke madu: M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi. Onye ezi omume ka I bu Jehova, Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku. Ekworom ekpochapuwom, N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu; Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya: Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi, Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu Ahuhu na nkpà achọtawom: Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi: Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu. Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova: Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe. Akpọkuwom I; zọputam, M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile. Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere. Anyam abua buru nche-abali nile uzọ, Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi. Nuru olum, dika ebere-Gi si di: Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu. Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ; Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya. Gi onwe-gi nọ nso, Jehova; Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu. Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha. Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi. Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu. Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile. Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu. Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um; Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem. Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi. Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu. Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di. Ndi-isi esob͕uwom n'efu; Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha. Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi, Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata. Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú; Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi, N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi. Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere. Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova, Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo. Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile; Anamahu kwa ha n'anya nke-uku. Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi. Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova: Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe. Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi: Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam. Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto; N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile. Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi; N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume. Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo. Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova; Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku. Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka. Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi; N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.