Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:73-104

ABÙ ỌMA 119:73-104 IGBOB

Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo. Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala. Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di. Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile. Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile. Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem. Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike: Ma okwu-Gi ka m'chereworo. Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi? N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku; Ma echezọghm ukpuru-Gi nile. Ùbọchi nke orù-Gi di ole? Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe? Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di. Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi: N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka. Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa; Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile. Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu, M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi. Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe. Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di: I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo. Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta; N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi. Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam. Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile: N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu. Ọ bu Gi nwem, zọputam; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì; Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche. Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile; Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku. Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya! Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche. Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom; N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim. Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche; N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche. Anamaghọta ihe kari ndi-okenye, N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo. Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula, Ka m'we debe okwu-Gi. Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem; N'ihi na I zíwom ihe. Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ! Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu. M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe: N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.