Cheta okwu I gwara orù-Gi,
Nke I meworom ka m'chere.
Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam:
Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu.
Ndi-nganga akwawom emò nke-uku:
Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem.
Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova,
We kasie onwem obi.
Iwe di ọku ejidewom,
N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi.
Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom
N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa.
Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali,
We debe iwu-Gi.
Nka ka m'nweworo,
Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile.
Òkèm ka Jehova bu:
Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile.
Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua:
Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di.
Echèrem èchìchè uzọm nile,
We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile.
Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya,
Idebe ihe nile I nyere n'iwu.
Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu;
Ma echezọghm iwu-Gi.
N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi
N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi.
Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu,
Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù.
Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi:
Zím ukpuru-Gi nile.
I meworo orù-Gi ezi ihe,
Jehova, dika okwu-Gi si di.
Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma;
N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo.
Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama;
Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo.
Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma;
Zím ukpuru-Gi nile.
Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu:
Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile.
Obi-ha bu nání abuba dika abuba;
Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.
Ọ dim nma na ewedawom n'ala;
Ka m'we muta ukpuru-Gi nile.
Iwu ọnu-Gi dim nma
Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.
Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike:
Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.
Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria;
N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo.
Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume,
Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala.
Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim,
Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di.
Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu;
N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku.
Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ:
Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile.
Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem,
Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile.
Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile,
Ka ihere we ghara imem.
Nkpuru-obim agwusiwo site n'ichọsi nzọputa-Gi ike:
Ma okwu-Gi ka m'chereworo.
Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike,
Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?
N'ihi na adiwom ka karama-akpukpọ di n'anwuru-ọku;
Ma echezọghm ukpuru-Gi nile.
Ùbọchi nke orù-Gi di ole?
Òle mb͕e I gēme ndi nēsob͕um ihe I kpere n'ikpe?
Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche,
Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.
Ihe nile I nyere n'iwu kwesiri ntukwasi-obi:
N'uzọ okwu-ugha ka ha nēsob͕um; biko, yerem aka.
Ọ fọduru nwantī ka ha me ka m'gwusia n'uwa;
Ma mu onwem arapughi ihe-iriba-ama-Gi nile.
Dika ebere-Gi si di, me ka m'di ndu,
M'gēdebe kwa ihe-àmà nke ọnu-Gi.
Jehova, rue mb͕e ebighi-ebi
Ka emeworo ka okwu-Gi guzosie ike n'elu-igwe.
Rue ọb͕ọ nile ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi di:
I mewo ka uwa guzosie ike, o we guzo.
Dika ikpé-Gi nile si di, ha nēguzo ta;
N'ihi na ihe nile bu ndi-orù-Gi.
Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku,
Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.
Rue mb͕e ebighi-ebi m'gaghi-echezọ ihe-iriba-ama-Gi nile:
N'ihi na ha ka I jiworo me ka m'di ndu.
Ọ bu Gi nwem, zọputam;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo.
Ndi nēmebi iwu elewo anyam ime ka m'la n'iyì;
Ma ihe-àmà-Gi nile ka m'gātukwasi uche.
Ahuwom nsọtu diri izu-okè nile;
Ma ihe, I nyere n'iwu sara mbara nke-uku.
Le ka m'si hu iwu-Gi n'anya!
Ogologo ubọchi nile ka nke ahu bu ihe m'natughari n'uche.
Ihe nile I nyere n'iwu nēme ka m'mara ihe kari ndi-irom;
N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka nke ahu dirim.
Kari ndi nile nēzím ihe ka m'nwere uche;
N'ihi na ihe-àmà-Gi nile bu ihe m'nātughari n'uche.
Anamaghọta ihe kari ndi-okenye,
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chebeworo.
Eb͕ochiwom ukwum abua ka ha ghara ibà n'uzọ ọjọ ọ bula,
Ka m'we debe okwu-Gi.
Esighm n'ikpé-Gi nile wezuga onwem;
N'ihi na I zíwom ihe.
Le ka okwu-ọnu-Gi si atọ okpo-ọnum utọ!
Ha nātọ ọnum utọ kari manu-aṅu.
M'nēsitei n'ihe-iriba-ama-Gi nile ghọta ihe:
N'ihi nka ka m'kpọworo uzọ okwu-ugha ọ bula asì.