Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:41-80

ABÙ ỌMA 119:41-80 IGBOB

Ọzọ, kwe ka ebere-Gi nile biakutem, Jehova, Bú nzọputa-Gi, dika okwu-ọnu-Gi si di. M'gāza kwa onye nātam uta okwu; N'ihi na atukwasiwom okwu-Gi obi. Anapusi-kwa-la okwu nke ezi-okwu n'ọnum; N'ihi na ikpé-Gi nile ka m'chereworo. M'gēdebe kwa iwu-Gi mb͕e nile Rue mb͕e nile ebighi-ebi. M'gējeghari kwa n'ebe sara mbara; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'chọworo. M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam. Ihe nke ihe nile I nyere n'iwu gātọkwam utọ nke-uku, Bú nke m'huworo n'anya. M'gāchili-kwa-ra ihe nile I nyere n'iwu ọbu-akam, bú ihe nke m'huworo n'anya; M'gātughari kwa uche n'ukpuru-Gi nile. Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere. Nka bu nkasi-obim nime nweda-n'alam: Na okwu-ọnu-Gi emewo ka m'di ndu. Ndi-nganga akwawom emò nke-uku: Ma esighm n'iwu-Gi wezuga onwem. Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi. Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi. Abù ọma ka ukpuru-Gi nile buruworom N'ulo ebe m'nọ dika ọbìa. Echetawom aha-Gi, Jehova, n'abali, We debe iwu-Gi. Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile. Òkèm ka Jehova bu: Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile. Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua: Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di. Echèrem èchìchè uzọm nile, We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile. Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu. Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi. N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi. Onye ekekọtaworo mu na ndi nile nātu egwu Gi n'otù ka m'bu, Onye ekekọtaworo mu na ndi nēdebe ihe-iriba-ama-Gi nile n'otù. Jehova, uwa juputara n'ebere-Gi: Zím ukpuru-Gi nile. I meworo orù-Gi ezi ihe, Jehova, dika okwu-Gi si di. Zím idi-nma nke ezi uche na ihe-ọmuma; N'ihi na ọ bu n'ihe nile I nyere n'iwu ka m'kwereworo. Tutu ewedam n'ala mu onwem nēme ihe ọjọ n'amaghi-ama; Ma ub͕u a okwu-ọnu-Gi ka m'debeworo. Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile. Ndi-nganga etekpuwom okwu-ugha dika ihe-ntekpu: Mu onwem gēwere obim nile chebe ihe-iriba-ama-Gi nile. Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku. Ọ dim nma na ewedawom n'ala; Ka m'we muta ukpuru-Gi nile. Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu. Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria; N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo. Jehova, amawom na ikpé-Gi nile bu ezi omume, Amawokwam na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka I wedaworom nala. Biko, kwe ka ebere-Gi buru ihe gākasi obim, Dika okwu-ọnu-Gi nke diri orù-Gi si di. Ka obi-ebere-Gi nile biakutem, ka m'we di ndu; N'ihi na iwu-Gi bu ihe nātọm utọ nke-uku. Ka ihere me ndi-nganga; n'ihi na ha ewerewo okwu-ugha me ka ikpém b͕agọ ab͕agọ: Ma m'gātughari uche n'ihe-iriba-ama-Gi nile. Ka ndi nātu egwu Gi laghachikutem, Ha gāma kwa ihe-àmà-Gi nile. Ka obim zue okè n'ukpuru-Gi nile, Ka ihere we ghara imem.