Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 119:153-176

ABÙ ỌMA 119:153-176 IGBOB

Hu nweda-n'alam, dọputam; N'ihi na echezọghm iwu-Gi. Kpe ọnum b͕aputakwam: Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu. Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ; N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile. Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova; Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu. Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um; Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem. Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi. Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya: Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu. Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu; Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di. Ndi-isi esob͕uwom n'efu; Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha. Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi, Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata. Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú; Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya. Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi, N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi. Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere; Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere. Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova, Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo. Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile; Anamahu kwa ha n'anya nke-uku. Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile; N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi. Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova: Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe. Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi: Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam. Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto; N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile. Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi; N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume. Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka; N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo. Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova; Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku. Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi; Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka. Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi; N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.