Onye ezi omume ka I bu Jehova,
Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omume
Na ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
Ekworom ekpochapuwom,
N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;
Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.
Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya:
Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.
Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi,
Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu
Ahuhu na nkpà achọtawom:
Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.
Ihe-àmà-Gi nile bu ezi omume rue mb͕e ebighi-ebi:
Me ka m'ghọta ihe, m'gādi kwa ndu.
Ewerewom obim nile kpọ nkpu; zam, Jehova:
Ukpuru-Gi nile ka m'gēchebe.
Akpọkuwom I; zọputam,
M'gēdebe kwa ihe-àmà-Gi nile.
Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi:
Okwu-Gi nile ka m'chere.
Anyam abua buru nche-abali nile uzọ,
Ka m'we tugharia uche n'okwu-ọnu-Gi.
Nuru olum, dika ebere-Gi si di:
Dika ikpé-Gi nile si di, Jehova, me ka m'di ndu.
Ha abiaruwo nso bú ndi nāb͕aso nzube ọjọ;
Ha nọ iwu-Gi n'ebe di anya.
Gi onwe-gi nọ nso, Jehova;
Ọzọ, ihe nile I nyere n'iwu bu ezi-okwu.
Site na mb͕e ochie ka m'maworo site n'ihe-àmà-Gi nile,
Na rue mb͕e ebighi-ebi ka I tọworo ntọ-ala-ha.
Hu nweda-n'alam, dọputam;
N'ihi na echezọghm iwu-Gi.
Kpe ọnum b͕aputakwam:
Dika okwu-ọnu-Gi si di, me ka m'di ndu.
Nzọputa di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ;
N'ihi na ha achọghi ukpuru-Gi nile.
Obi-ebere-Gi nile bara uba, Jehova;
Dika ikpé-Gi nile si di, me ka m'di ndu.
Ha di ọtutu, bú ndi nēsob͕um na ndi nākpab͕um;
Ma esighm n'ihe-àmà-Gi nile wezuga onwem.
Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi;
N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.
Le otú m'huworo ihe-iriba-ama-Gi nile n'anya:
Dika ebere-Gi si di, Jehova, me ka m'di ndu.
Isi ihe nke okwu-Gi bu ezi-okwu;
Ọzọ, rue mb͕e ebighi-ebi ka ikpé ọ bula nke ezi omume-Gi di.
Ndi-isi esob͕uwom n'efu;
Ma okwu-Gi nile ka obim tuworo oké egwu ha.
Obi nātọ mu onwem utọ n'ihi okwu-ọnu-Gi,
Dika onye nāhuta ọtutu ihe-nkwata.
Okwu-ugha ka m'kpọworo asì, m'we kpọ ya ihe-árú;
Ma iwu-Gi ka m'huworo n'anya.
Ub͕ò asa n'ubọchi ka m'toworo Gi,
N'ihi ikpé nile nke ezi omume-Gi.
Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n'anya nwere;
Ọ dighi kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere.
Elewom anya nzọputa-Gi, Jehova,
Ọ bu kwa ihe nile I nyere n'iwu ka m'meworo.
Nkpuru-obim edebewo ihe-àmà-Gi nile;
Anamahu kwa ha n'anya nke-uku.
Edebewom ihe-iriba-ama-Gi nile na ihe-àmà-Gi nile;
N'ihi na uzọm nile di n'iru Gi.
Ka iti-nkpum biarue nso n'iru Gi, Jehova:
Dika okwu-Gi si di, me ka m'ghọta ihe.
Ka aririọ-amaram bia n'iru Gi:
Dika okwu-ọnu-Gi si di, naputam.
Ka eb͕ub͕ere-ọnum kwuwa otuto;
N'ihi na I nezím ukpuru-Gi nile.
Ka irem bùa abù bayere okwu-ọnu-Gi;
N'ihi na ihe nile I nyere n'iwu bu ezi omume.
Ka aka-Gi buru ihe iyerem aka;
N'ihi na ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'rọputaworo.
Achọsiwom nzọputa-Gi ike, Jehova;
Iwu-Gi bu kwa ihe nātọm utọ nke-uku.
Ka nkpuru-obim di ndu, ọ gēto kwa Gi;
Ka ikpé-Gi nile ye-kwa-ram aka.
Efughariwom dika aturu nke furu efu; chọ orù-Gi;
N'ihi na echezọghm ihe nile I nyere n'iwu.