Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēchebe ihe-àmà-Ya nile bu, Ndi nēwere obi-ha nile chọ Ya. E, ha emeghi ajọ omume; N'uzọ-Ya nile ka ha nēje ije. Gi onwe-gi ewerewo ihe-iriba-ama-Gi nye ayi n'iwu, Ka ayi we debesie ha ike. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na edoziwo uzọm nile Idebe ukpuru-Gi nile! Mb͕e ahu ihere agaghi-emem, Mb͕e m'nēlegide anya n'ebe ihe nile I nyere n'iwu di. M'gēwere obi ziri ezi kele Gi, Mb͕e m'mutara ikpé nile nke ezí omume-Gi. Ukpuru-Gi nile ka m'gēdebe: Arapusilam arapu. Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di. Obim nile ka m'wereworo chọ Gi: Ekwela ka m'si n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi. Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova: Zím ukpuru-Gi nile. Eb͕ub͕ere-ọnum ka m'wereworo kọ akukọ Ikpé nile nke ọnu-Gi. N'uzọ ihe-àmà-Gi nile ka obi nātọm utọ, Dika ọ gātọm utọ bayere àkù nile. N'ihe-iriba-ama-Gi nile ka m'gātughari uche, M'gēlegide kwa uzọ-Gi nile anya. Ihe ukpuru-Gi nile gātọm utọ nke-uku: M'gaghi-echezọ okwu-Gi. Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu; M'gēdebe kwa okwu-Gi. Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta. Ọbìa ka m'bu n'uwa: Ezonarilam ihe nile I nyere n'iwu. Nkpuru-obim etiwawo n'ihi ọchichọ O ji chọsie ikpé-Gi nile ike mb͕e nile. I basiworo ndi-nganga ndi abuworo ọnu nba ike, Ndi nēsi n'ihe nile I nyere n'iwu jehie. Wepu ita-uta na nleda n'arum; N'ihi na echebewom ihe-àmà-Gi nile. Ọzọ, ndi-isi nọduru ala kwurita okwu imegidem: Ma orù-Gi nātughari uche n'ukpuru-Gi nile. Ọzọ, ihe-àmà-Gi nile bu ihe nātọm utọ nke-uku, Ha bu ndi nādum ọdu. Nkpuru-obim nārapara n'ájá: Dika okwu-Gi si di, me ka m'di ndu. Akọrọm akukọ uzọm nile, I we zam: Gi zím ukpuru-Gi nile. Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile: M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile. Nkpuru-obim atupuwo dika miri site n'iru-újú: Dika okwu-Gi si di, me ka m'guzosie ike. Wezuga uzọ okwu-ugha n'ebe m'nọ: Were kwa amara nyem iwu-Gi. Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m'rọputaworo: Ikpé-Gi nile ka m'doworo n'irum. Araparawom n'aru ihe-àmà-Gi nile: Jehova, emela ka ihere mem. N'uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu ka m'gāb͕a ọsọ, N'ihi na I gēme ka obim sa mbara.
Gụọ ABÙ ỌMA 119
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 119
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 119:1-32
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị