Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānu Olum, bú aririọ-amaram nile. N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ, Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram: Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu. M'we kpọkue aha Jehova; Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya. Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu; E, Chineke-ayi nwere obi-ebere. Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu: Enweghm ike, O we nyem nzọputa. Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi; N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma. N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu, I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri, I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam. M'gējeghari n'iru Jehova N'ala nile nke ndi di ndu. Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu: Ewedara mu onwem n'ala nke-uku: Mu onwem siri na nkujam Madu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha. M'gēsi aṅa nyeghachi Jehova Nmeso ọma Ya nile O mesoworom? Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile. Ihe di oké ọnu-ahia n'anya Jehova Ka ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu. Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi: Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi; I tọpuwo ab͕um nile. Gi ka m'gāchuru aja ekele, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile; N'ogige nile nke ulo Jehova, N'etiti gi, Jerusalem. Tonu Ja.
Gụọ ABÙ ỌMA 116
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 116
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 116:1-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo