Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 111

111
1Tonu Ja.
M'gēwere obim nile kele Jehova,
N'ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel.
2Ọlu nile nke Jehova di uku,
Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa.
3Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu:
Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.
4Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile:
Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.
5Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya:
Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.
6O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile,
N'inye ha ihe-nketa mba nile.
7Ọlu nile nke aka-Ya bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi;
Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ukpuru-Ya nile bu.
8Ihe anākwagide rue mb͕e nile ebighi-ebi ka ha bu,
Ha bu ihe anēme n'ezi-okwu na izi-ezi.
9Nb͕aputa ka O ziteworo ndi-Ya;
O nyewo ọb͕ub͕a-ndu-Ya iwu rue mb͕e ebighi-ebi:
Ihe di nsọ na ihe anātu egwu ka aha-Ya bu.
10Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu;
Ezi uche ka ndi nile nēme ha nwere:
Otuto-Ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ABÙ ỌMA 111: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye