Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya; Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ, Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ. Ọ kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha; O we bara ndi-eze nba n'ihi ha; Si, Unu emetula ndim etere manu aka, Unu emejọ-kwa-la ndi-amumam. O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri. O zìri otù nwoke iga n'iru ha; Erere Josef ka ọ buru orù: Ha were ab͕u kesie ukwu-ya abua ike; Nkpuru-obi-ya bàra n'ígwè: Rue mb͕e okwu-Ya rère; Okwu-ọnu Jehova nuchara ya. Eze ziri ozi, we tọpu ya; Bú onye nāchi ndi di iche iche, o we tupu ya n'ulo-nkpọrọ. O mere ya ka ọ buru onye-nwe ulo-ya, Na onye nāchi ihe nile o nwetara: Ike ndi-isi-ya ab͕u dika nkpuru-obi-ya chọrọ, Na ime ka ndi-okenye-ya mara ihe. Israel we bata nime Ijipt; Ọzọ, Jekob nọrọ dika ọbìa n'ala Ham. O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha. Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.
Gụọ ABÙ ỌMA 105
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 105
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 105:12-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị