Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 102:1-28

ABÙ ỌMA 102:1-28 IGBOB

Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti. Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa. N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku, Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku. Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim. Site n'olu ize-umem Ọkpukpum araparawo n'anu-arum. Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe. Amuruwom anya, we ghọ Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo. Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta; Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi. N'ihi na eriwom ntu dika nri, Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum. Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi: N'ihi na I buliwom elu, we tufuem. Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala. Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi; Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile. Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo. N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara. Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova, Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi: N'ihi na Jehova ewuwo Zaion, O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya. O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru, O ledaghi kwa ekpere-ha anya. Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu: Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja. N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya; Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya; Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ; Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu; Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion, Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem; Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù, Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè. O wedawo ikem n'uzọ; O bilatawo ubọchim nile. Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile: N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide. Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa. Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha: Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide, Nkpuru-ha gēguzosi ike n'iru Gi.