ABÙ ỌMA 102:1-28
ABÙ ỌMA 102:1-28 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti. Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa. N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku, Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku. Etib͕uwo obim dika ihe akuru n'ala, o we kpọnwua; N'ihi na echezọwom iri nrim. Site n'olu ize-umem Ọkpukpum araparawo n'anu-arum. Eyirim okwolo nke ọzara; Aghọwom ihe dika okwukwu nke nkpọnkpọ ebe. Amuruwom anya, we ghọ Ihe dika nnunu ntà nke nání ya nọ n'elu-ulo. Ogologo ubọchi nile ka ndi-irom nātam uta; Ndi nāwi ara imegidem ejiwom ṅua iyi. N'ihi na eriwom ntu dika nri, Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum. Site n'iwe-Gi na ọnuma-Gi: N'ihi na I buliwom elu, we tufuem. Ubọchim nile di ka onyinyo nke nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu; Mu onwem nākpọnwu kwa dika ihe akuru n'ala. Ma Gi onwe-gi, Jehova, nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi; Ncheta-Gi nādiru kwa ọb͕ọ nile. Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo. N'ihi na nkume-ya nile nātọ ndi-orù-Gi utọ, Ha nēme-kwa-ra ájá-ya amara. Mba nile gātu kwa egwu aha Jehova, Eze nile nke uwa gātu kwa egwu ebube-Gi: N'ihi na Jehova ewuwo Zaion, O mewo Onwe-ya ka ahú Ya nime ebube-ya. O chewo ekpere nke onye nēnweghi ihe iru, O ledaghi kwa ekpere-ha anya. Agēde nka n'akwukwọ nye ọb͕ọ nēso n'azu: Ọzọ, otù ndi nke agēkè gēto Ja. N'ihi na O siwo n'ebe di elu nke ebe nsọ Ya lepu anya; Jehova esitewo n'elu-igwe legide uwa anya; Inu ize-ume nke onye-nkpọrọ; Itọpu ndi nāghaghi inwu anwu; Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion, Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem; Mb͕e ndi nile di iche iche gāchikọta onwe-ha n'otù, Ha na ala-eze nile, ifè Jehova òfùfè. O wedawo ikem n'uzọ; O bilatawo ubọchim nile. Asirim, Chinekem, emela ka m'la n'elu n'etiti ubọchim nile: N'ọb͕ọ nile ka arọ-gi nādigide. Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa. Ha onwe-ha gāla n'iyì, ma Gi onwe-gi nēguzogide: Ha nile gāka kwa nká dika uwe; Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāb͕anwe ha, agāb͕anwe kwa ha: Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile, Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu Umu nke ndi-orù-Gi gēbigide, Nkpuru-ha gēguzosi ike n'iru Gi.
ABÙ ỌMA 102:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nụrụ ekpere m, O ONYENWE ANYị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa. Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ. Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m. Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ. Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị. Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ. Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ. Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ. Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. Ma gị ONYENWE ANYị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola. Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. Mba niile ga-atụ egwu aha ONYENWE ANYị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. Nʼihi na ONYENWE ANYị ga-ewugharị Zayọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too ONYENWE ANYị: “ONYENWE ANYị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha ONYENWE ANYị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem, mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe. O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ. Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”