Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi, Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu. Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu. Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu, Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu. Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi. Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di, Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya. Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe: Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume, Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè, Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile, Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ; Ọdum di n'amá. Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya, Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa; Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya. Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.
Gụọ ILU 26
Geere nke a ntị ILU 26
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 26:1-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị