Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 25:15-28

ILU 25:15-28 IGBOB

Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi, Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu. Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi; Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya. Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi; Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì. Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu. Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapu Ka itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu. Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu, Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di. Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri; Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya, Jehova gākwughachi kwa gi. Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo: Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa. Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù. Dika miri oyi si adiri nkpuru-obi nāda #mbà, Otú a ka okwu ọma anuru site n'ala di anya di. Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi Ka onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu. Iracha manu-aṅu ri nne adighi nma: Otú a ọ buru na madu egwuputa ala nsọpuru-ha ọ bughi nsọpuru. Obodo etikpọrọ etikpọ nke mb͕idi nādighi Ka onye ọ bula nke nādighi-ebọchi mọ-ya bu.