Mb͕e i soro onye nāchi achi iri nri, Ghọta nke-ọma onye ahu nke nọ n'iru gi; Tukwasi kwa mma n'akpiri-gi, Ma ọ buru na onye nri-ya nātọ ya utọ ka i bu. Achọsila nri utọ ya ike; Ebe nri ahu bu nri okwu-ugha. Adọb͕ula onwe-gi n'ọlu ibu ọgaranya; Site na nghọta-gi ra ya aka. Ì gātukwasi anya-gi abua na ya? ọ dighi kwa: N'ihi na àkù nēmere onwe-ya nkù n'ezie, Dika ugo ka ọ nēfesi n'elu-igwe. Erila nri nke onye nwere anya ọjọ, Achọsi-kwa-la nri utọ ya ike: N'ihi na dika o si echè èchìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di: Rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ nāsi gi; Ma obi-ya adighi n'ebe i nọ. Iberibe-nri-gi nke i riworo ka i gāb͕ọputa, Okwu-gi nile nke di utọ ewe funari gi. Ekwula okwu na nti onye-nzuzu; N'ihi na ọ gēleda ezi uche nke okwu-gi nile anya. Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi; Abà-kwa-la n'ọhia ọ bula nke umu-nb͕ei: N'ihi na Onye-nb͕aputa-ha di ike; Ya onwe-ya gēkpe ọnu-ha megide gi. Me ka obi-gi ba n'idọ-aka-na-nti, Me kwa ka nti-gi abua ba n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma. Eb͕ochila idọ-aka-na-nti n'aru nwata: Mb͕e i gēji nkpa-n'aka tie ya, ọ gaghi-anwu. Gi onwe-gi gēji nkpa-n'aka tie ya, We naputa nkpuru-obi-ya n'ala-mọ. Nwam, ọ buru na obi-gi mara ihe, Obim gāṅuri, ọbuná nkem: Akurum abua gāwuli kwa n'ọṅù, Mb͕e eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nēkwu ihe ziri ezi. Ekwela ka obi-gi kwoso ndi-nmehie ekworo: Kama n'egwu Jehova ka i gānọ ogologo ubọchi nile. N'ihi na ọdi-n'iru aghaghi idi; Agaghi-ebipu kwa olile-anya-gi.
Gụọ ILU 23
Geere nke a ntị ILU 23
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 23:1-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị