Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua. Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na Jehova Ka m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi. Èdetaghm i isi ihe Nime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma; Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu, Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu? Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu, Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama: N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha, We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe. Gi na onye-iwe abula eyì; I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo: Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile, We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà. Abula otù nime ndi gānara madu n'aka, Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche. Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ, N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi? Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi, Nke nna-gi-hà kpaworo. Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.
Gụọ ILU 22
Geere nke a ntị ILU 22
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ILU 22:17-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo