N'ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù- ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu; nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie: na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai.
N'ubọchi nke iri-na-otù onye-isi umu Asha nwere, bú Pagiel nwa Ọkran, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Pagiel nwa Ọkran.
N'ubọchi nke-iri-na-abua onye-isi umu Naftali nwere, bú Ahira nwa Inan, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputura n'ihe-nsure-ọku; nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahira nwa Inan.
Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n'ubọchi etere ya manu, site n'aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua: afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n'ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n'ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n'ọtùtù-ha: ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua: ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu. Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.