Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 7:66-89

ỌNU-ỌGUGU 7:66-89 Bible Nso (IGBOB)

N'ubọchi nke-iri onye-isi umu Dan nwere, bú Ahieza nwa Amishadai, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù- ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu; nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie: na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahieza nwa Amishadai. N'ubọchi nke iri-na-otù onye-isi umu Asha nwere, bú Pagiel nwa Ọkran, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Pagiel nwa Ọkran. N'ubọchi nke-iri-na-abua onye-isi umu Naftali nwere, bú Ahira nwa Inan, wetara ihe-ya nso: onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma; na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputura n'ihe-nsure-ọku; nēsì ísì utọ; na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku; na otù nkpi, iji chu àjà-nmehie; na ehi abua, na ebulu ise, na nkpi ise, na umu-ebulu ise nke b͕ara otù arọ, iji chu ihe àjà nke àjà-udo: nka bu onyinye iji biaru nso nke Ahira nwa Inan. Nka bu onyinye nke ira ebe-ichu-àjà nye Chineke, n'ubọchi etere ya manu, site n'aka ndi-isi Israel: afere ọla-ọcha iri na abua, na ọkwa-nwusa ọla-ọcha iri na abua, na ngaji ọla-edo iri na abua: afere ọla-ọcha ọ bula di ọgu shekel isi na iri n'ọtùtù, ọkwa-nwusa ọ bula di kwa ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù: ọla-ọcha nile nke ihe nile di nnù shekel isi n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ngaji ọla-edo iri na abua ahu, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ, ha di shekel iri shekel iri n'ọtùtù-ha, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ọla-edo nile nke ngaji di ọgu shekel isi n'ọtùtù-ha: ehi nile iji chu àjà-nsure-ọku di oke-ehi iri na abua, ebulu-ya di iri na abua, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di iri na abua, na onyinye-inata-iru-ọma-ha: nkpi iji chu àjà-nmehie di iri na abua: ehi nile nke ihe àjà nke àjà-udo di orú oke-ehi na anọ, ebulu-ya di ọgu atọ, nkpi-ya di ọgu atọ, umu-ebulu-ya nke b͕ara otù arọ di ọgu atọ. Nka bu onyinye nke irara ebe-ichu-àjà nye Chineke, mb͕e etesiri ya manu. Ma mb͕e Moses bara n'ulo-ikwū nzute ikpayere Ya uka, ọ we nu Olu ahu ka Ọ nāgwa ya okwu site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, site n'etiti cherubim abua ahu: O we gwa ya okwu.

ỌNU-ỌGUGU 7:66-89 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼụbọchị nke iri, Ahieza nwa Amishadai, onyendu ebo Dan butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Ahieza nwa Amishadai nyere. Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa Okran, onyendu ebo Asha butere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Pagịel nwa Okran nyere. Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa Enan, onyendu ebo Naftalị nyere onyinye nke ya. Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ. O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Ahira nwa Enan nyere. Ndị a bụ onyinye ndị ndu ụmụ Izrel wetara maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ: efere ọlaọcha iri na abụọ, na efere ọlaọcha ịkwọsa mmiri iri na abụọ, na efere ọlaedo iri na abụọ. Ịdị arọ nke efere ọlaọcha ọbụla dị otu narị shekel na iri shekel atọ. Ịdị arọ nke efere ịkwọsa mmiri ọbụla dị iri shekel asaa. Ịdị arọ efere ọlaọcha niile ha wetara bụ puku shekel abụọ na narị shekel anọ, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke otu nʼime efere ọlaedo iri na abụọ ndị ahụ ụda nsure ọkụ na-esi isi ụtọ juru nʼime ha bụ iri shekel, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke efere ọlaedo ndị ahụ niile bụ otu narị shekel na iri shekel abụọ. Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ. Ndị a niile bụ onyinye e nyere maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ. Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka ONYENWE ANYị si gwa ya okwu.