ỌNU-ỌGUGU 29
29
1Ọzọ, n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ubọchi uda-opì ka ọ gāburu unu. 2Unu gēme àjà-nsure-ọku ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova; otù nwa-oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ nke zuru okè: 3na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ahu, 4na otù uzọ n'uzọ iri iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu: 5na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu: 6nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.
7Ọzọ, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje. 8ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova, bú ihe ísì utọ; otù nwa-oke-ehi, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otú arọ; nke zuru okè ha gāburu unu: 9na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu otù ebulu ahu, 10otù uzọ n'uzọ iri, otú uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu: 11otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nmehie nkpuchi-nmehie, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.
12Ọzọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje, unu gēme-kwa-ra Jehova ememe ubọchi asa: 13unu gēweta kwa nso àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova; umu-oke-ehi iri na atọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ; nke zuru okè ka ha gābu: 14na onyinye-inata-iru-ọma-ha, utu ọka flour agwara manu, uzọ atọ n'uzọ iri iji chu oke-ehi ọ bula nime oke-ehi iri na atọ ahu, uzọ abua n'uzọ iri iji chu ebulu ọ bula nime ebulu abua ahu, 15otù uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, iji chu nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu iri na anọ ahu: 16na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
17N'ubọchi nke-abua unu gēweta kwa nso umu-oke-ehi iri na abua, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 18na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na abua ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 19na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.
20N'ubọchi nke-atọ kwa oke-ehi iri-na-otù, ebulu, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè; 21na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi iri na otù ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 22na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inatu-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
23N'ubọchi nke-anọ kwa oke-ehi iri, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 24na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iri ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 25na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
26N'ubọchi nke-ise kwa oke-ehi iteghete, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otú arọ, nke zuru okè; 27na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha iji chu oke-ehi iteghete ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 28na otú nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
29N'ubọchi nke-isi kwa oke-ehi asatọ, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ zuru okè: 30na onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asatọ ahu, na iji chu ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 31na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya nile.
32N'ubọchi nke-asa kwa oke-ehi asa, ebulu abua, umu-aturu iri na anọ nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 33na onyinye-inata-ọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi asa ahu, na iji ebulu abua ahu, na iji chu umu-aturu ahu, n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 34na otù nkpi iji chu àjà-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
35N'ubọchi nke-asatọ nb͕ochi gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje: 36ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku. bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:' otú oke-ehi, otú ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè: 37onyinye-inata-iru-ọma-ha, na àjà-ihe-oṅuṅu nile ha, iji chu oke-ehi ahu, na iji chu ebulu ahu, na iji chu umu-aturu ahu, gādi n'ọnu-ọgugu-ha, dika ikpé ahu si di: 38na otù nkpi iji chu aja-nmehie; nāgughi àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.
39Ndia ka unu gēmere Jehova na mb͕e nile unu akara àkà, nāgughi nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, iji chu àjà-nsure-ọku nile unu, na iji chu onyinye-inata-iru-ọma nile unu, na iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu nile unu, na iji chu àjà-udo nile unu. 40Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ỌNU-ỌGUGU 29: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.