Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 26:1-51

ỌNU-ỌGUGU 26:1-51 IGBOB

O rue, mb͕e ihe-otiti ahu gasiri, na Jehova gwara Moses na Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, okwu, si, Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, onye ọ bula nke nāpukuru usu-ndi-agha n'Israel. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we kpayere ha uka n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si, Gutanu ọnu-ọgugu ndi Israel, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru; dika Jehova nyere Moses na umu Israel iwu, bú ndi nēsi n'ala Ijipt puta. Reuben, bú ọkpara Israel: umu-ndikom Reuben; nke Hanok bu ab͕uru ndi Hanok: nke Palu bu ab͕uru ndi Palu: nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Kami bu ab͕uru ndi Kami. Ndia bu ab͕uru ndi Reuben: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iteghete, na ọgu isi, na iri. Umu ndikom Palu kwa; Eliab. Umu-ndikom Eliab; Nemuel, na Detan, na Abairam. Ndia bu Detan ahu na Abairam ahu, ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi lusoro Moses, luso kwa Eron, ọ̀gù nime nzukọ Kora, mb͕e ha lusoro Jehova ọ̀gù: ala we saghe ọnu-ya, loda ha na Kora, mb͕e nzukọ ahu nwuru; mb͕e ọku ahu ripiara ọgu ndikom iri-na-abua na iri ahu, ha we ghọ ihe-iriba-ama. Ma umu-ndikom Kora anwughi. Umu-ndikom Simeon, dika agburu nile ha si di: nke Nemuel bu ab͕uru ndi Nemuel: nke Jamin bu ab͕uru ndi Jamin: nke Jakin bu ab͕uru ndi Jakin: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera: nke Shaul bu ab͕uru ndi Shaul. Ndia bu ab͕uru ndi Simeon, orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-ise, na ọgu iri. Umu-ndikom Gad, dika ab͕uru nile ha si di: nke Zefon bu ab͕uru ndi Zefon: nke Hagi bu ab͕uru ndi Hagi: nke Shuni bu ab͕uru ndi Shuni: nke Ọzni bu ab͕uru ndi Ọzni: nke Iri bu ab͕uru ndi Iri: nke Arod bu ab͕uru ndi Arod: nke Areli bu ab͕uru ndi Areli. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Gad, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ ise, na nnu, na ọgu ise. Umu-ndikom Juda, Ia na Onan: ma Ia na Onan nwuru n'ala Kenean. Umu-ndikom Juda, dika ab͕uru nile ha si di, bu; nke Shila bu ab͕uru ndi Shila: nke Perez bu ab͕uru ndi Perez: nke Zera bu ab͕uru ndi Zera. Umu-ndikom Perez bu kwa; nke Hezron bu ab͕uru ndi Hezron: nke Hamul bu ab͕uru ndi Hamul. Ndia bu ab͕uru Juda, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ iteghete, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise. Umu-ndikom Isaka, dika ab͕uru nile ha si di: nke Tola bu ab͕uru ndi Tola: nke Puva bu ab͕uru ndi-Punait: nke Jashub bu ab͕uru ndi Jashub: nke Shimron bu ab͕uru ndi Shimron. Ndia bu ab͕uru Isaka, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asatọ, na ọgu iri-na-ise. Umu-ndikom Zebulun, dika ab͕uru nile ha si di: nke Sered bu ab͕uru ndi Sered: nke Ilon bu ab͕uru ndi Ilon: nke Jahleel bu ab͕uru ndi Jahleel. Ndia bu ab͕uru ndi Zebulun, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-otù, na ọgu ise. Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim. Umu-ndikom Manase: nke Makia bu ab͕uru ndi Makia: Makia we muta Gilead: nke Gilead bu ab͕uru ndi Gilead. Ndia bu umu-ndikom Gilead: nke Ieza bu ab͕uru ndi Ieza: nke Hilek bu ab͕uru ndi Hilek. nke Asriel bu ab͕uru ndi Asriel: nke Shekem bu ab͕uru ndi Shekem: nke Shemida bu ab͕uru ndi Shemida: nke Hefa bu ab͕uru ndi Hefa. Ma Zelọfehad nwa Hefa enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: aha umu-ndinyom Zelọfehad bu Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza. Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise. Ndia bu umu-ndikom Efraim, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shutela bu ab͕uru ndi Shutela: nke Beka bu ab͕uru ndi Beka: nke Tahan bu ab͕uru ndi Tahan. Ndia bu umu-ndikom Shutela: nke Iran bu ab͕uru ndi Iran. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di. Umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: nke Bela bu ab͕uru ndi Bela: nke Ashbil bu ab͕uru ndi Ashbil: nke Ahairam bu ab͕uru ndi Ahairam: nke Shefufan bu ab͕uru ndi-Shufamait: nke Hufan bu ab͕uru ndi Hufan. Umu-ndikom Bela bu Ad na Neaman: nke Ad bu ab͕uru ndi Ad: nke Neaman bu ab͕uru ndi Neaman. Ndia bu umu-ndikom Benjamin, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-anọ. Ndia bu umu-ndikom Dan, dika ab͕uru nile ha si di: nke Shuham bu ab͕uru ndi Shuham. Ndia bu ab͕uru nke Dan, dika ab͕uru nile ha si di. Ab͕uru nile nke ndi Shuham, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ asatọ, na otù nnù. Umu-ndikom Asha, dika ab͕uru nile ha si di: nke Imna bu ab͕uru ndi Imna: nke Ishvi bu ab͕uru ndi Ishvi: nke Beria bu ab͕uru ndi Beria. Nke umu-ndikom Beria: nke Hiba bu ab͕uru ndi Hiba: nke Malkiel bu ab͕uru ndi Malkiel. Ma aha nwa-nwayi Asha bu Sera. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Asha, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri. Umu-ndikom Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: nke Jahzeel bu ab͕uru ndi Jahzeel: nke Guni bu ab͕uru ndi Guni: nke Jiza bu ab͕uru ndi Jiza: nke Shilem bu ab͕uru ndi Shilem. Ndia bu ab͕uru Naftali, dika ab͕uru nile ha si di: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ ise, na nnù iri-na-atọ, na ọgu iri. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, orú nnù ogu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù anọ, na ọgu isi, na iri.