ỌNU-ỌGUGU 19
19
1Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, 2Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n'iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n.aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya: 3unu gēnye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ gēme ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, otù onye gēb͕u ya n'iru ya: 4Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, fesa ufọdu nime ọbara-ya na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ub͕ò asa: 5otù onye gēsure kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu ọku n'anya-ya; akpukpọ-ya, na anu-ya, na ọbara-ya, tiyere nsi-ya, ka o gēsure ọku: 6onye-nchu-àjà gēwere kwa osisi cedar, na hyssop, na ogho uhie, tubà ya n'etiti nsure-ọku nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu. 7onye-nchu-àjà gāsu kwa uwe-ya, sa kwa anu-aru-ya na miri, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū, onye-nchu-àjà gāru kwa árú rue anyasi. 8Onye ahu nke nēsure ya ọku gāsu kwa uwe-ya na miri, sa kwa anu-aru-ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 9Nwoke nke di ọcha gāchikọta ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu, do ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū n'ebe di ọcha, ọ gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ndebe ibu miri nke idi-na-nsọ: àjà-nmehie ka ọ bu. 10Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, ukpuru ebighi-ebi. 11Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa: 12onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa. 13Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'Israel n'ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a. 14Nka bu iwu mb͕e madu nwuru n'ulo-ikwū: onye ọ bula nke nāba n.ulo-ikwū ahu, na onye ọ bula nke nọ n'ulo-ikwū ahu, gāru árú ubọchi asa. 15Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu. 16Onye ọ bula nke nēmetu onye eji mma-agha b͕u, ma-ọbu onye nwuru anwu, ma-ọbu ọkpukpu madu, ma-ọbu ílì, aru, n'ọhia sara iru, ọ gāru árú ubọchi asa. 17Ha gēwere kwa ufọdu nime ntu nsure-ọku àjà-nmehie ahu bayere onye ahu ruru árú, agētiye kwa miri nērù erù n'elu ya nime ihe: 18nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru: 19onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi. 20Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu. 21Ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru ebighi-ebi; onye nēfesa miri nke idi-na-nsọ ahu gāsu kwa uwe-ya; onye nēmetu miri nke idi-na-nsọ ahu aru gāru kwa árú rue anyasi. 22Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
ỌNU-ỌGUGU 19: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.