Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba, ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli. Ob͕e achicha nke utu ọka mbu unu ka unu gēbuli, ka ọ buru àjà-nbuli: dika àjà-nbuli nke ebe-nzọcha-ọka, otú a ka unu gēbuli ya. Site n'utu ọka mbu unu unu gēnye Jehova àjà-nbuli rue ọb͕ọ nile unu.
Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n'amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n'iwu, nke Jehova gwaworo Moses, bú ihe nile nke Jehova nyere unu n'iwu n'aka Moses, site n'ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n'iru rue ọb͕ọ nile unu; ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n'ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n'iru, Jehova, n'ihi amaghi-ama-ha: agāb͕aghara kwa nzukọ nile nke umu Israel, ha na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha; n'ihi na n'ebe ndi Israel nile nọ emere ya n'amaghi-ama. Ma ọ buru na otù onye emehie n'amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n'amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n'amaghi-ama, n'iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya. Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama. Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya. N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya.
Umu Israel we nọ n'ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n'ubọchi-izu-ike. Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile. Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n'ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya. Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū. Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu.
Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha mere onwe-ha ọnu-ọnu n'elu usọ uwe-ha rue ọb͕ọ nile ha, tiyekwasi kwa n'ọnu-ọnu nke usọ uwe ahu eriri-nma ogho anunu: ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko: ka unu we cheta me kwa ihe nile M'nyere n'iwu, buru kwa ndi diri Chineke-unu nsọ. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, ka M'we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.