Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 15:17-41

ỌNU-ỌGUGU 15:17-41 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba, ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli. Ob͕e achicha nke utu ọka mbu unu ka unu gēbuli, ka ọ buru àjà-nbuli: dika àjà-nbuli nke ebe-nzọcha-ọka, otú a ka unu gēbuli ya. Site n'utu ọka mbu unu unu gēnye Jehova àjà-nbuli rue ọb͕ọ nile unu. Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n'amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n'iwu, nke Jehova gwaworo Moses, bú ihe nile nke Jehova nyere unu n'iwu n'aka Moses, site n'ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n'iru rue ọb͕ọ nile unu; ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nzukọ nile nke umu Israel nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha; n'ihi na amaghi-ama ka ọ bu, ha onwe-ha ewetawo kwa nso onyinye-ha iji biaru nso, bú àjà-ọku ichuru Jehova, na àjà-nmehie-ha n'iru, Jehova, n'ihi amaghi-ama-ha: agāb͕aghara kwa nzukọ nile nke umu Israel, ha na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha; n'ihi na n'ebe ndi Israel nile nọ emere ya n'amaghi-ama. Ma ọ buru na otù onye emehie n'amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie. Onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra nkpuru-obi ahu nmehie-ya, bú nke nēme ihe n'amaghi-ama, mb͕e ọ nēmehie n'amaghi-ama, n'iru Jehova, ikpuchiri ya nmehie-ya; agāb͕aghara kwa ya. Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama. Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya. N'ihi na ọ bu okwu Jehova ka ọ lelíworo anya, n'ihi kwa na ọ bu ihe O nyere n'iwu ka o mebiworo; agēbipu nkpuru-obi ahu ebipu, ajọ omume-ya gādikwasi ya. Umu Israel we nọ n'ọzara, ha we huta otù nwoke ka ọ nāchikọta nkú n'ubọchi-izu-ike. Ndi hutara ya ka ọ nāchikọta nkú we me ka ọ biakute Moses na Eron na nzukọ Israel nile. Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n'ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya. Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū. Nzukọ ahu nile we me ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, ha we were nkume tub͕ue ya, ọ we nwua; dika Jehova nyere Moses iwu. Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si ha mere onwe-ha ọnu-ọnu n'elu usọ uwe-ha rue ọb͕ọ nile ha, tiyekwasi kwa n'ọnu-ọnu nke usọ uwe ahu eriri-nma ogho anunu: ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko: ka unu we cheta me kwa ihe nile M'nyere n'iwu, buru kwa ndi diri Chineke-unu nsọ. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt puta, ka M'we buru unu Chineke: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

ỌNU-ỌGUGU 15:17-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ndị Izrel okwu sị ha, ‘mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-akpọbata unu nʼime ya, ọ bụrụ na unu erie nri dị nʼala ahụ, wetanụ ụfọdụ nʼime nri ahụ dịka onyinye nye ONYENWE ANYị. Wetanụ ogbe achịcha site nʼọka mbụ unu ga-akwọ, chee ya nʼihu ONYENWE ANYị dịka onyinye e wetara site nʼebe ịzọcha ọka. Unu aghaghị inye ONYENWE ANYị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. “ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile ONYENWE ANYị nyere site nʼaka Mosis, bụ iwu ndị a niile ONYENWE ANYị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ ONYENWE ANYị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa. Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke ONYENWE ANYị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie. Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu ONYENWE ANYị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie. A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị ọbịa nọ nʼetiti ha mmehie ha, nʼihi na mmadụ ndị a niile akpachaghị anya mehie. “ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ naanị otu onye mehiere na-amaghị ama, ọ ga-eweta nwa nne ewu gbara otu afọ maka aja mmehie. Onye nchụaja a ga-eji ya chụọ aja ikpuchitere onye ahụ na-amaghị ama mehie mmehie ya nʼihu ONYENWE ANYị. Mgbe ekpuchichara mmehie ya, a ga-agbaghara onye ahụ. Ọ bụ otu iwu a dịrị onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maọbụ nwa afọ Izrel, maọbụ onye ọbịa nke bi nʼetiti unu. “ ‘Ma onye ọbụla kpachapụrụ anya mehie, maọbụ nwa afọ maọbụ onye ọbịa, nke na-ekwulu ONYENWE ANYị, a ga-ebipụ onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Nʼihi na ha eledala okwu ONYENWE ANYị anya, mebie ihe o nyere nʼiwu. A ghaghị ibipụ onye dị otu a, mmehie ha ga-adịkwa ha nʼisi.’ ” Mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara, e jidere otu onye nʼime ha ka ọ na-akpa nkụ nʼụbọchị izuike. Ndị hụrụ ya ebe ọ na-akpa nkụ duuru ya jekwuru Mosis na Erọn na ọgbakọ ụmụ Izrel. Ha tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ nʼihi na o doghị anya ihe e kwesiri ime ya. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Nwoke a ghaghị ịnwụ. Ọgbakọ Izrel niile ga-atụ ya nkume nʼazụ obodo.” Ya mere, ọgbakọ ahụ kpọpụrụ ya nʼazụ obodo jiri nkume tugbuo ya, dịka ONYENWE ANYị nyere Mosis nʼiwu. ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nʼọgbọ niile na-abịa unu ga-adụnye eriri akwa nʼọnụ ala ala uwe unu. Unu ga-eji eriri na-acha anụnụ anụnụ dụnye ya. Eriri akwa ndị a dị nʼọnụ ọnụ uwe unu ga-eme ka unu cheta iwu niile ONYENWE ANYị nyere unu. Ka unu rube isi na ha hapụ imerụ onwe unu site na ịgbaso ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu na anya unu. Mgbe ahụ unu ga-echeta irube isi nʼiwu m niile, bụrụ ndị e doro nsọ nye Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu ịbụ Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu.’ ”