Ha we si n'iledo ala ahu lata n'ọgwugwu ọgu ubọchi abua. Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu. Ha we kọrọ ya akukọ, si Ayi bara n'ala ahu ebe i zigara ayi, ọzọ kwa, ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya ka ọ bu; nka bu kwa nkpuru-ya. Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu. Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan. Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma. Ma ndikom ahu ndi soro ya rigo siri, Ayi apughi irigo imegide ndi ahu, n'ihi na ndi di ike ka ha bu kari ayi. Ha we me ka akukọ ọjọ putara umu Israel bayere ala ahu nke ha ledoro, si, Ala ahu, nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala nke nēripia ndi bi ya ka ọ bu; ọzọ ndi nile ayi huru n'etiti ya bú ndikom toro ogologo. N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 13
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 13:25-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị