Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 10

10
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Mere onwe-gi opì ọla ọcha abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha: ha gābu-kwa-ra gi ihe bayere nkpọkọta nzukọ Israel, na ihe bayere nbuli-ije nke omuma-ulo-ikwū nile ha. 3Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n'ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. 4Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ. 5Mb͕e unu gāfù opì ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Iru-anyanwu gēbuli kwa ije. 6Mb͕e unu gāfù opì ub͕ò nke-abua ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Ndida gēbuli kwa ije: ha gāfù opì ka ọ we dasie uda ike bayere nbuli-ije nile ha. 7Ma n'ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike. 8Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu. 9Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu. 10Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.
11O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo. 12Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran. 13Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses. 14Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 15Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua. 16Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon. 17Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije. 18Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 19Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai. 20Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel. 21Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha. 22Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 23Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua. 24Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni. 25Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya. 26Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran. 27Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan. 28Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije.
29Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel. 30Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru. 31Ọ we si, Biko, arapula ayi; n'ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n'ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya. 32O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma.
33Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike 34Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.
35O rue, nime nbuli-ije ib͕e ahu, na Moses nāsi, Bilie, Jehova, ka ndi-iro-Gi b͕asa; ka ndi nākpọ Gi asì b͕apu kwa n'iru Gi. 36Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌNU-ỌGUGU 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye