Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha. Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n'aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha. Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha. Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha. Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile. Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi. Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham; I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka I bu. I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie; I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile, na n'aru ndi nile nke ala-ya; n'ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta. I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike. Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya. Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu: I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n'iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n'iwu site n'aka Moses, bú orù-Gi: ọ bu kwa nri nke sitere n'elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha. Ma ndi ahu na nna-ayi-hà mere ihe na nganga, kwesie olu-ha ike, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha. Ọbuná mb͕e ha mere nwa-ehi awuru awu nye onwe-ha, si, Nka bu chi-gi nke mere ka i si n'Ijipt rigoputa, ha we me oké ihe-nlelì-anya; ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè. I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha. Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.