Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 9:1-21

NEHEMAIA 9:1-21 Bible Nso (IGBOB)

Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha. Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n'aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha. Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha. Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha. Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile. Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi. Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham; I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka I bu. I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie; I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile, na n'aru ndi nile nke ala-ya; n'ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta. I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike. Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya. Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu: I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n'iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n'iwu site n'aka Moses, bú orù-Gi: ọ bu kwa nri nke sitere n'elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha. Ma ndi ahu na nna-ayi-hà mere ihe na nganga, kwesie olu-ha ike, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha. Ọbuná mb͕e ha mere nwa-ehi awuru awu nye onwe-ha, si, Nka bu chi-gi nke mere ka i si n'Ijipt rigoputa, ha we me oké ihe-nlelì-anya; ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè. I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha. Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.

NEHEMAIA 9:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke otu ọnwa ahụ, ndị Izrel niile zukọkwara na obubu ọnụ, yiri uwe iru ụjụ, kpokwasịkwa onwe ha ntụ nʼisi. Ndị si nʼagbụrụ Izrel wezugakwara onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ niile nọ. Ha guzoro nʼọnọdụ ha kwupụta mmehie ha na ajọ omume nke nna nna ha. Ha guzokwara nʼebe ahụ ha nọ gụọ site nʼakwụkwọ iwu nke ONYENWE ANYị, bụ Chineke ha ruo awa atọ. Ha jikwa awa atọ nke ọzọ kwupụta mmehie ha, na ife ONYENWE ANYị Chineke ha ofufe. Mgbe ahụ Jeshua, Bani, Kadmiel, Shebanaya, Buni, Sherebaya, Bani na Kenani rigoro guzo nʼelu ihe nguzo ndị Livayị. Ha jiri oke olu kpọkuo ONYENWE ANYị bụ Chineke ha. Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, “Bilienụ ọtọ, too ONYENWE ANYị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.” “Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile. Gị onwe gị, naanị gị bụ ONYENWE ANYị. Gị kere eluigwe, ọ bụladị eluigwe kachasị elu, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, ụwa na ihe niile dị nʼime ya, oke osimiri niile na ihe niile dị nʼime ha. Ọ bụ gị na-enye ihe niile ndụ, usuu niile nke eluigwe na-akpọkwa isiala nye gị. “Gị, onwe gị bụ ONYENWE ANYị Chineke ahụ, onye họpụtara Ebram site nʼobodo Ụọ nke ndị Kaldịa, kpọpụta ya, gụgharịa aha ya ka ọ bụrụ Ebraham. Ị hụkwara nʼobi ya kwesiri ntụkwasị obi nye gị, gị na ya gbakwara ndụ na ị ga-enye ụmụ ya ala ndị Kenan, nke ndị Het, nke ndị Amọrait, nke ndị Periz, nke ndị Jebus na nke ndị Gigash. I mezuola nkwa gị nʼihi na ị bụ onye ezi omume. “Ị hụrụ nsogbu na iru ụjụ niile nke nna nna anyị ha nʼala Ijipt; ị nụkwara akwa ha nʼakụkụ Osimiri Uhie. I gosiri Fero na ndịisi ọchịchị ya na ndị ya niile ọtụtụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube nʼihi na ị hụrụ otu ha siri site na nganga juru ha obi mesoo ndị gị mmeso ọjọọ. Ụwa niile maara aha gị taa nʼihi ọrụ ebube ndị a niile ị rụrụ. I kewara Osimiri Uhie abụọ mee ka ndị gị site nʼala akọrọ gafee. Ma i mere ka ndị iro ha na-achụ ha ọsọ nwụọ nʼime oke osimiri ahụ. Ha mikpuru dịka nkume danyere nʼime mmiri, nke oke osimiri. I ji ogidi igwe ojii duo nna nna anyị ha nʼehihie, ma were ogidi ọkụ duo ha nʼabalị, inye ha ìhè ka ha ghara ijehie ụzọ. “I sitere nʼeluigwe gwa ha okwu, ị rịdatara nʼugwu Saịnaị, ị nyere ha iwu na ntụziaka niile ziri ezi, nyekwa ha ụkpụrụ na ihe niile dị mma nke enyere nʼiwu. I mere ka ha mata ụbọchị izuike gị dị nsọ, nyekwa ha iwu site nʼọnụ ohu gị Mosis, ka ha debe iwu gị na ụkpụrụ gị niile. I sitere nʼeluigwe nye ha achịcha mgbe agụụ gụrụ ha, sitekwa na nkume nye ha mmiri mgbe akpịrị kpọrọ ha nkụ. I sịkwara ha baa nʼime ala ahụ inweta ala ahụ bụ nke i weliri aka gị ṅụọ iyi inye ha. “Ma nna nna anyị ha erubeghị isi nʼokwu gị, nʼihi isiike ha na nganga ha. Ha egeghị ntị ọbụla, ha echetakwaghị ihe ịrịbama niile i meere ha. Kama ha nupuru isi họpụtara onwe ha onyeisi ga-eduru ha ịlaghachi Ijipt. Ma ị bụ Chineke onye na-eme ebere, onye na-agbaghara mmehie ndị gị mgbe ọbụla. Ị bụ onye obiọma, onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. I jupụtara nʼịhụnanya na amara mgbe niile. Nʼihi ya, ị gbakụtaghị ha azụ, ọ bụladị mgbe ha meere onwe ha nwa ehi ha kpụrụ akpụ kwuo sị, ‘Nke a bụ chi unu. Ọ bụ ya si nʼala Ijipt dupụta anyị,’ maọbụ mgbe ha mehiere megide gị nʼụzọ niile. “Ma nʼihi obi ebere gị nke dị ukwuu, ị hapụghị ha ka ha nwụọ nʼọzara. Ogidi igwe ojii ahụ duuru ha ụbọchị niile, ma ogidi ọkụ ahụ dukwara ha abalị niile. I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha. Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị.