Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 8:1-8

NEHEMAIA 8:1-8 IGBOB

Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu. Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n'iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa. O we gua nime ya n'iru amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n'iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu. Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n'elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n'akuku ya, n'aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n'aka-ekpe-ya. Ezra we saghe akwukwọ n'anya ndi ahu nile; (n'ihi na ọ nọ n'elu n'ebe ndi ahu nile nọ;) ma mb͕e ọ saghere ya, ndi ahu nile guzoro: Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala. Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n'ebe-nguzo-ha. Ha wee gua n'akwukwọ ahu, bú n'iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya.