Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 8:1-8

NEHEMAIA 8:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ndị mmadụ niile zukọrọ dịka otu onye na mbara ala dị nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri. Ha gwara Ezra onye nkuzi ka ọ weta akwụkwọ Mosis, nke ONYENWE ANYị nyere ndị Izrel nʼiwu. Ya mere, Ezra, onye nchụaja wepụtara akwụkwọ Iwu ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa asaa nʼihu mkpọkọta ahụ bụ nke ndị ikom na ndị inyom na onye ọbụla ga-aghọta ihe mejupụtara. O chere ihu nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri were oke olu gụọ ya site nʼụtụtụ ruokwa ehihie nʼihu ndị nwoke, ndị nwanyị na ndị ọzọ nwere ike ịghọta ihe o na-agụ. Mmadụ niile gekwara ntị na ngụpụta nke akwụkwọ iwu ahụ. Ezra onye ode akwụkwọ, rigoro nʼelu ihe mgbakwasị ụkwụ ha mere maka nke a. Ndị guzo nʼaka nri ya bụ, Matitaia, Shema, Anaia, Ụraya, Hilkaya na Maaseia. Ndị guzo nʼaka ekpe ya bụkwa ndị a: Pedaia, Mishael, Malkija, Hashum, Hashbadana, Zekaraya na Meshulam. Ezra meghere akwụkwọ ahụ mgbe mmadụ niile na-ahụzu ya nʼihi na o guzoro nʼebe dị elu mgbe ọ na-agụ ya. Mmadụ niile guzoro ọtọ mgbe ọ na-agụ ya. Mgbe ahụ, Ezra gọziri ONYENWE ANYị Chineke ukwu ahụ, mmadụ niile zakwara sị; “Amen! Amen!” Ha chịlịri aka ha abụọ elu, kpọọ isiala nye ONYENWE ANYị. Ndị Livayị aha ha bụ Jeshua, Bani, Sherebaya, Jamin, Akub, Shabetai, Hodia, Maaseia, Kelita, Azaraya, Jozabad, Hanan na Pelia, kuziri ndị mmadụ ihe dị nʼIwu mee ka ha ghọta ya dịka ha guzo nʼebe ahụ. Ha gụpụtara site nʼakwụkwọ iwu Chineke ahụ, sụgharịa ya, kọwazie ọkpụrụkpụ okwu niile dị nʼihe a gụpụtara, mee ka ndị mmadụ ghọta ihe a na-agụpụta nke ọma.

NEHEMAIA 8:1-8 Bible Nso (IGBOB)

Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu. Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n'iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa. O we gua nime ya n'iru amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n'iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu. Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n'elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n'akuku ya, n'aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n'aka-ekpe-ya. Ezra we saghe akwukwọ n'anya ndi ahu nile; (n'ihi na ọ nọ n'elu n'ebe ndi ahu nile nọ;) ma mb͕e ọ saghere ya, ndi ahu nile guzoro: Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala. Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n'ebe-nguzo-ha. Ha wee gua n'akwukwọ ahu, bú n'iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya.