Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 6

6
1O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m'lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;) 2o rue, na Sanbalat na Geshem ziterem ozi, si, Bia, ka ayi zukọta n'otù n'obodo ntà nime ndagwurugwu nke Ono. Ma ndi ahu nēchè èchìchè imejọm emejọ. 3M'we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m'nēje, apughkwam irida: n'ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m'nārapu ya, we ridakuru unu? 4Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m'we zaghachi ha okwu dika okwu a si di. 5Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n'aka-ya; 6edewo nime ya, si, Anuwo ya n'etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n'ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di. 7Ọzọ kwa, i guzowo ndi-amuma ikpọsa òkù bayere gi nime Jerusalem, si, Eze di nime Juda: ma ub͕u a eze gānu ya dika okwu ndia si di. Ma ub͕u a bia, ka ayi durita onwe-ayi ọdu. 8M'we zigara ya ozi, si, Ọ dighi ka okwu ndia si di nke gi onwe-gi nēkwu, kama gi onwe-gi nēchèputa ha n'obi-gi. 9N'ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n'ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.
10Ma mu onwem batara n'ulo Shemaia nwa Delaia nwa Mehetabel, ma emechidoworo onye ahu uzọ; o we si, Ka ayi zukọta n'ulo Chineke, n'etiti ulo uku Chineke, ka ayi mechi kwa uzọ nile nke ulo uku Chineke: n'ihi na ha nābia ib͕u gi; e, n'abali ka ha nābia ib͕u gi. 11M'we si, Nwoke dika mu onwem, ọ̀ gāb͕alaga? ònye di kwa, nke di ka mu onwem, nke gābà n'ulo uku Chineke, we di ndu? m'gaghi-abà nime. 12M'we mata, ma, le, ọ bughi Chineke zitere ya: kama okwu amuma nka ka o kwuru imegidem: ma Sanbalat na Tobaia goro ya. 13N'ihi nka ka egoro onye ahu, ka m'we tua egwu, me otú a, we mehie, ka ha we nwe kwa ya inyem aha ọjọ, ka ha we tam uta. 14Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m'tua egwu.
15Ewe luzue mb͕idi ahu n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n'ọgu ubọchi abua na iri na abua. 16O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a. 17Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka. 18N'ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n'ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye. 19Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NEHEMAIA 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye