Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 6

6
1O we si n'ebe ahu pua; O we bia n'ala nke aka Ya; ndi nēso uzọ-Ya so kwa Ya. 2Mb͕e ubọchi-izu-ike ruru, O we malite izi ihe n'ulo-nzukọ-ha: mb͕e ha nuru Ya ibobo we nwua ọra madu n'aru, ha si, Òle ebe ka Nwoke a nwere ihe ndia? ha si kwa, Gini bu amam-ihe enyere Nwoke a? òle isi ọlu ike di otú a aluru n'aka-Ya? 3Nwoke a, Ọ̀ bughi onye-ọ̀kà ahu, nwa Meri, na nwa-nne Jemes, na Joses, na Judas, na Saimon? umu-nne-Ya ndinyom, hà anọghi kwa n'ebe a n'etiti ayi? Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. 4Jisus we si ha, Onye-amuma abughi onye adighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'etiti ikwu-ya, na n'ulo-ya. 5Ọ pughi kwa ilu ọlu di ike ọ bula n'ebe ahu, ma-ọbughi na O bikwasiri ndi-nriaria ole-na-ole aka-Ya abua, we me ka aru di ha ike. 6Ekweghi-ekwe-ha we ju Ya anya.
Ọ nējeghari kwa obodo ntà nile ha buruburu nēzí ihe.
7Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ; 8O we nye ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bula n'ije-ha, ma-ọbughi nání nkpa-n'aka; ka ha ghara iwere ob͕e achicha, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ego n'ihe-ọkiké-ha; 9ma ka ha je nēyi akpukpọ-ukwu sandal: Ọ si ha, Unu eyi-kwa-la uwe-ime abua. 10O we si ha, Ebe ọ bula unu gābà n'ulo, nọgide n'ulo ahu rue mb͕e unu putara n'ebe ahu. 11Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n'ebe ahu, tichapu ájá di n'okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà. 12Ha we pua, kwusa ka madu chègharia. 13Ha nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike.
14Herod, bú eze, we nu, n'ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n'ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya. 15Ma ndi ọzọ si, Ọ bu Elaija. Ndi ọzọ si kwa, Ọ bu onye-amuma, dika otù nime ndi-amuma. 16Ma mb͕e Herod nuru ya, ọ si, Jọn, onye mu onwem bipuru isi-ya, emere onye ahu ka o si n'ọnwu bilie. 17N'ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n'ihi na ọ luru ya na nwunye. 18N'ihi na Jọn nāsi Herod, O zighi gi ezi n'iwu inwe nwunye nwa-nna-gi. 19Ma Herodias dobere ya iwe n'obi, ọ chọ-kwa-ra ib͕u ya; ma ọ pughi; 20n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya. 21Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili; 22mb͕e nwa-nwanyi Herodias onwe-ya bata-kwa-ra, te egwú, o we tọ ha utọ, bú Herod na ndi ya na ha nānọdu na nri; eze we si nwa-ab͕ọghọ ntà ahu, Riọm ihe ọ bula i nāchọ, na m'gēnye gi ya. 23O we ṅuara ya iyi, si, Ihe ọ bula i gāriọm, m'gēnye gi ya, rue nkera nke ala-ezem. 24O we pua, si nne-ya, Gini ka m'gāriọrọ onwem? O we si, Isi Jọn onye nēme baptism. 25O were ọsọ bata ngwa ngwa n'ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa ub͕u a. 26O we wuta eze ahu n'obi nke-uku; ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi nọduru na nri, ọ chọghi iju ya. 27Ngwa ngwa eze we zipu onye-agha nēche nche, nye ya iwu ibaute isi-ya: o we je we bipu isi-ya n'ulo-nkpọrọ, 28we bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya. 29Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n'ílì.
30Ndi-ozi Jisus we zukọ n'ebe Jisus nọ; ha we kọrọ Ya ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa. 31O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n'ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N'ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe. 32Ha we je n'ub͕ọ-ha iche rue ebe bu ọhia. 33Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n'obodo ahu nile b͕akọta n'ebe ahu n'ukwu ala, buru ha uzọ. 34O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe. 35Mb͕e chi nēji nb͕u a, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Ebe a bu ọhia, chi nēji kwa ub͕u a: 36zilaga ha, ka ha we je n'ubi na obodo ntà nile buruburu, zuru onwe-ha ihe ha gēri. 37Ma Ọ zara, si ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si Ya, Àyi gēe izuta ob͕e achicha nke ọgu shilling iri, nye ha ka ha rie? 38Ọ si ha, Òb͕e achicha ole ka unu nwere? jenu, le. Mb͕e ha mara, ha si, Ise, na azù abua. 39O we gwa ha ka madu nile nọdu ala n'òtù di iche iche n'elu ahihia ndu. 40Ha we nọdu ala n'ahiri di iche iche, ọgu ise ọgu ise, na ọgu abua na iri ọgu abua na iri. 41O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa ob͕e achicha ahu; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ndi ahu; O we kère ha nile azù abua ahu. 42Ha nile we rie, afọ ju-kwa-ra ha. 43Ha we tutukọ iberibe nile, njuputa nkata iri na abua, na nke azù abua ahu. 44Ma ndi riri ob͕e achicha ise ahu bu nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri.
45Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu. 46Mb͕e O kelesiri ha, O jere n'ugwu ahu ikpe ekpere. 47Mb͕e o ruru anyasi, ub͕ọ ahu we di n'etiti oké osimiri, nání Ya onwe-ya nọ kwa n'ala. 48Mb͕e Ọ huru ha ka ha nādọb͕u onwe-ha n'ọnyinya-ub͕o-ha, n'ihi na ifufe nēfegide ha, O we biakute ha dika nche nke-anọ n'abali, nēje ije n'elu oké osimiri; O we chọ igabiga ha: 49ma mb͕e ha huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, ọ di ha ka Ọ bu mọ, ha we tisie nkpu ike: 50n'ihi na ha nile huru Ya, obi we lọ ha miri. Ma Ọ kpayere ha uka ngwa ngwa, si ha, Nwenu obi-ike: ọ bu Mu; unu atula egwu. 51O we rigokuru ha n'ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n'aru ri nne n'onwe-ha; 52n'ihi na ha aghọtaghi ọlu ebube nke ob͕e achicha ise, kama emereri ka obi-ha me etili.
53Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala rue Genesaret, tinye ub͕ọ-ha n'ala. 54Mb͕e ha putara n'ub͕ọ, ngwa ngwa ọra we mazu Ya, 55we b͕aghari n'ala ahu dum, malite ibughari ndi aru nādighi nma n'ute-ha, n'ebe ha nuru na Ọ nọ. 56Ebe ọ bula Ọ batara, n'obodo ntà, ma-ọbu n'obodo, ma-ọbu n'ubi, ha we nātọb͕ọ ndi aru-ha nādighi ike n'ọma-ahia, ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọbuná ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

MAK 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye