Ọ we kpọ ndi-ozi iri na abua ahu biakute Ya, O we malite izipu ha abua abua; O nye-kwa-ra ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ; O we nye ha iwu ka ha ghara iwere ihe ọ bula n'ije-ha, ma-ọbughi nání nkpa-n'aka; ka ha ghara iwere ob͕e achicha, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ego n'ihe-ọkiké-ha; ma ka ha je nēyi akpukpọ-ukwu sandal: Ọ si ha, Unu eyi-kwa-la uwe-ime abua. O we si ha, Ebe ọ bula unu gābà n'ulo, nọgide n'ulo ahu rue mb͕e unu putara n'ebe ahu. Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n'ebe ahu, tichapu ájá di n'okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà. Ha we pua, kwusa ka madu chègharia. Ha nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike.
Gụọ MAK 6
Geere nke a ntị MAK 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 6:7-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị