O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna? N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu. O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu. N'ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.
O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n'ala; we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me. Ala nāmi nkpuru site n'onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n'oko.
Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n'ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo.
O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya? Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n'ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n'ala; ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.
O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya: ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.
N'ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọzọ. Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n'ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya. Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a. Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì? O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe? Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?