Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 4:21-41

MAK 4:21-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ? Nʼihi na ihe niile e zoro ezo ga-apụta ihe ma ihe niile e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesịa kpughee. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa. Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.” Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi. Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme. Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya. Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya? Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala. Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.” O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile. Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.” Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?” Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, “Kwụsị! Dere jii!” Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii. Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?” Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!”

MAK 4:21-41 Bible Nso (IGBOB)

O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna? N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu. O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu. N'ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n'ala; we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me. Ala nāmi nkpuru site n'onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n'oko. Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n'ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo. O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya? Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n'ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n'ala; ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya. O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya: ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile. N'ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọzọ. Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n'ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya. Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a. Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì? O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe? Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?