Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n'azu obodo ahu bia. Ha we kuru Ya bia n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, ma asugharia ya, Ebe okpokoro-isi. Ha we che n'iru Ya manya-vine nke agwara myrrh: ma Ọ naraghi ya. Ha we kpọgide Ya n'obe, kè kwa uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà n'elu ha, nke onye ọ bula gēwe. Ma ọ bu oge hour nke-atọ, ha we kpọgide Ya n'obe. Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU. Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya. Ewe mezue ihe edere n'akwukwọ nsọ, nke si, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya. Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi, si n'elu obe ridata. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n'etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.