MAK 15:21-32
MAK 15:21-32 Bible Nso (IGBOB)
Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n'azu obodo ahu bia. Ha we kuru Ya bia n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, ma asugharia ya, Ebe okpokoro-isi. Ha we che n'iru Ya manya-vine nke agwara myrrh: ma Ọ naraghi ya. Ha we kpọgide Ya n'obe, kè kwa uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà n'elu ha, nke onye ọ bula gēwe. Ma ọ bu oge hour nke-atọ, ha we kpọgide Ya n'obe. Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU. Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya. Ewe mezue ihe edere n'akwukwọ nsọ, nke si, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya. Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi, si n'elu obe ridata. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n'etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.
MAK 15:21-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya. Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”). Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya. Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe. Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ. Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu. Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya. A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ. Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.” Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya! Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.